ENYO JONAL Vọl 3, Nọ 1, 2022 94 ENYO JONAL Vọl 3, Nọ 1, 2022 Website: https://www.enyojonal.com NWAANYỊ ỊZỤLITE NWA NAANỊ YA: NZIPỤTA YA N’AGỤMAGỤ IGBO A HỌỌRỌ CHISOM NNEAMAKA OKAFOR Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University, Igbariam Campus, Anambra State & NKECHINYERE ANTHONIA NWOKOYE Nnamdi Azikiwe University, Awka Ụmịedemede Ịzụlite ụmụaka bụ otu n’ime ọrụ pụrụ iche dịịrị nne na nna. Na nwa dị njọ maọbụ na ọ dị mma, na-esite n’ụzọ nne na nna ya si zụlite ya. Ọ bụ eziokwu na ọrụ a dịịrị nne na nna mana ọ bụ nne ka ọ metụtakarịrị. Mgbe nna pụrụ ịchọ ihe ezinaụlọ ya ga-eri, ọ bụ nne ka ilekọta ụmụ ha dịịrị. ụfọdụ mmadụ kwenyere na ụmụ nwaanyị riri mperi n’ịzụ nwa nke mere na nwa ha zụrụ naanị ha anaghị aba uru ebe ụfọdụ kwenyesiri ike na nwa nwaanyị zụrụ naanị ya anaghị ala n’iyi. N’ihi nke a ka e ji họrọ isi okwu a, ‘Nwaanyị Ịzụ Nwa naanị Ya: Nzipụta Ya n’Agụmagụ Igbo a Họọrọ’. A gbasoro usoro nkọwa wee mee nchọcha iji nyochaa ma chọpụta nkwenye nke dabara adaba. Agụmagụ ndị e ji mee nchọcha a bụ Onye kpaa Nkụ Ahụhụ na Adaeze. Atụtụ e ji mee nchọcha a bụ atụtụ Modarizim. E bu n’obi izipụta na ụmụaka nwaanyị zụrụ na-aba uru, ihe ndị na-ebutere nwaanyị ịzụ nwa naanị ya na ụzọ a ga-esi belata ọnọdụ a. Nchọcha a ga- enyere ọhanaeze, ndị nkuzi na ụmụ akwụkwọ aka ịchọpụta na e nwere ike ibelata arụ ụmụ ntorobịa na-eme n'obodo n’oge ugbua ma ọ bụrụ na e nye ụmụ nwaanyị ezigbo nkwado na enyemaka pụrụ iche ka ha wee nwee ike zụpụta ọtụtụ ụmụaka ga-eso dozie obodo. A chọpụtara na ọ bụrụ na gọọmentị mebe iwu ga-enye ụmụaka ụmụ nwaanyị na-azụ naanị ha ohere ịgụ akwụkwọ n’efu, ọ ga-eme ka ụmụaka a hụ obodo ha n’anya ma tụnye ụtụ nke ha ga-eme ka obodo ha na-aga n’ihu. Nke a ga-emekwa ka ọtụtụ nsogbu ndị ntorobịa na-eme n’obodo belata. Mmalite Ọtụtụ nsogbu na agwa ọjọọ ndị ntorobịa na-akpa n’oge ugbua hiwere isi na ntọala na ọzụzụ e nyere ha n’ezinaụlọ ha. Baịbụlụ Goodnews, Ilu 22:6 sị, kuziere ụmụaka otu ha ga-esi bie ndụ, ha ga-echeta ya ụbọchị niile nke ndụ ha. Onye ka ọrụ ikuziri nwata ụzọ obibi ndụ dịịrị